Hosea 2

1“Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’

Ntaramahụhụ na nlọta

2“Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya,
nʼihi na ọ bụghị nwunye m,
mụ onwe m abụkwaghị di ya.
Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya,
ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.
3Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ,
aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya.
Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara,
ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ,
were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.
4Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m,
nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.
5Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko,
ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere.
Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya,
ndị na-enye m nri na mmiri,
ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’
6Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu;
aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje.
7Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha.
Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha.
Mgbe ahụ, ọ ga-asị,
‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m,
nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’
8Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m,
na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv,
na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile
nke o ji na-efe Baal.

9“Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara,
na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru.
Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m,
nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.
10Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya
nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,
Ndị ya na ha na-akwa iko

ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.
11Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị;
ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ,
nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.
12Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi,
nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya;
aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa,
anụ ọhịa ga-eripịa ha.
13Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile
bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile,
ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya,
pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya,
ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

14“Nʼihi nke a, aga m arara ya,
duba ya nʼime ọzara,
jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ.
15Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya,
gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya.
Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa,
nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta.

16“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“Ị ga-akpọ m ‘Di m,’
ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.
Maọbụ, Baal nʼasụsụ Hibru

17Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya,
ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ.
18Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ,
meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ,
na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ.
Aga m emebi ngwa agha niile,
agha niile ga-akwụsịkwa.
Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.
19Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi;
aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi,
nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere.
20Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị.
Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị.

21“Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“M ga-azaghachi eluigwe,
ha ga-azaghachi ala.
22Ala ga-azaghachi ọka
na mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv,
mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril.
23Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ.
Aga m egosi ịhụnanya m nʼahụ onye ahụ m kpọrọ, ‘Onye m na-ahụghị nʼanya.’
Enwekwa obi ebere nʼahụ Lo-Ruhama,

M ga-asịkwa ndị ahụ a kpọrọ, ‘Ndị na-abụghị ndị m,
Ya bụ, Lo-ammi,
’ ‘Unu bụ ndị nke m,’
Ha ga-azakwa, ‘Chineke m ka ị bụ.’ ”
Copyright information for IboBIU